The content is just an excerpt from the complete note from Igbo Lesson Note from SS1 – SS3. Check below for the appropriate link

FIRST TERM: E-LEARNING NOTES

SUBJECT: IGBO LANGUAGE                             CLASS: SS1

IZU MBU  (WEEK  1)                                             UBOCHI

IHE OMUMU—-ASUSU IGBO

ISIOKWUEkwumekwu banyere Ezinaulo.

NDISIOKWU:

  • Nkowa ihe bu ezinaulo na udidi Ezinaulo di iche iche
  • Oru umuaka,nne, nna,umuaka,umunne,umunna,ikwu na ibe n’ezinaulo
  • Uru ezinaulo baara obodo

NKOWA IHE BU EZINAULO.

Ndi bekee kowara ezinaulo dika mbikota onu di,nwunye,umu ha na odibo ha.Ha bu ndi nwere otu obara ma burukwa otu umunna bikoro onu n’otu mkpuke maobu bisaa ebisa.

Ezinaulo ndi igbo gunyere nwoke,nwunye maobu ndi nwuye,umu,umunne,umunna,ikwu na ibe na odibo.

Ezinaulo bu ndi mmadu sitere n’otu agburu maobu obara.Ndi mebere Ezinaulo  bu  nna,nne,umu ha na ikwu na ibe.A maara umunne,umunna na ndi ogo dika ikwunaibe.

UDIDI EZINAULO DI ICHE ICHE.

A  bia n’ala Igbo,e nwere udidi ezinaulo ato. Ha bu:

  1. Ezinaulo mkpuke (Nuclear family)
  2. Ezinaulo ubara(Polygamous family)
  3. Ezinaulo mbisa (Extended family)

1. Ezinaulo mkpuke: Nke a gunyere nwoke,nwunye na umu ha.Ha na-ebi n’otu ulo ma na-emekorita.Nchikwaa ezinaulo ahu di nwoke n’aka.

2. Ezinaulo Ubara( Polygamous Family)  Ndi mebere ezinaulo a bu nna, ndi nwunye ya, na umu ha.N’udi ezinaulo a,otu nwoke nwere ike luo nwaanyi abuo maobu karia.Nchikwa ezinaulo ahu dum di  nwoke ahu n’aka.

 

3. Ezinaulo mbisaNdi mebere ezinaulo a bu; nne, nna, umuaka ha, na ikwunaibe.

Ezinaulo mbisa gunyere nwoke,nwunye, ndi nwunye,umunne,umunna,ikwu na ibe na odibo.Ha abughi ndi bi n’ otu ngwuru.N’ezie, ha bu ndi ruru nduduga ndu ato, maobu karia dika nnukwu nna na nnukwu nne.

 

NNWALE

I) Gini bu ezinaulo?

ii) kedu ndi mebere ezinaulo ubara?

ORU DI ICHE ICHE EZINAULO NA-ARU .

SEE ALSO  SS2 Third Term Commerce Lesson Note – Banking

1.Otu n’ime oru kachasi oru ezinaulo na-aru bu  izulite umuntakiri n’ usoro omenaala na ezi agwa.

2.O na-enye ndi no na ya  aka  n’oge  mkpa maobu nsogbu.

3.N’oge ugbu a, o bukwa oru diiri ezinaulo inye ndi no n’ime ya ezi mmuta site na ikwuru ha ugwo akwukwo n’ulo akwukwo iche iche.

4.Ezinaulo na-enye ndi no nay a ndumodu.kuzikwara ha ezi uzo mgbe ha na-ejehie.

5.N’ime  ezinaulo ka a na-amuta asusu nke bu uda mmekorita mmadu na ibe.

 

  ORU UMUAKA:

  1. Ihu na mmiri di n’ulo

2.izacha  na hichaa ulo

3.Isu akwa

4.Ikpa nku

5.Isi  nri

6.Ije ahia

7.Iko oruubi

8.Isucha ahihia

9.Isa efere na ite

10.Idebe iwu na omenaala ndi Igbo

11.Inye okenye ugwu na nsopuru na ije ozi ndi ozo n’ezinaulo.

12.irubere nne na nna isi

13.izacha ama egwuregwu

NNE:  

  1. Irubere di ya isi
  2. Ikpa ezi agwa
  3. Isi nri site ya nke oma
  4. Iga ahia zuta ihe oriri
  5. Isa umuaka ahu

6.Inye umuaka ezi ozuzu.

7.Nne na-enye umuaka ndumodu.

NNA:

O bu ya bu onyeisi n’ezinaulo

Nna na- akuziri ndi ezinaulo ya agwa oma di ka:

  • Irusi oru ike
  • Iweta ego nri

3    Izu umuaka

4    Inye umuaka ndumodu

5   Idozi esemokwu daputara n’ezinaulo.

  1. Ikwu ugwo akwukwo
  2. Ikuziri umuaka omenaala Igbo.
  3. O bu oru diiri nna nwe ezinaulo ihu na ihunanya na egwu chineke di n’ezinaulo ya.

 

DOWNLOAD Complete note for SS1 FIRST TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS1 SECOND TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS1 THIRD TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS2 FIRST TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS2 SECOND TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS2 THIRD TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS3 FIRST TERM >> LINK

SEE ALSO  SS1 Third Term Commerce Lesson Note – Public Enterprises

 

FIRST TERM: E-LEARNING NOTES

SUBJECT:     IGBO LANGUAGE

CLASS: SS2

IZUUKA NKE ABUO          UBOCHI———-

IHE OMUMU: ASUSU IGBO

KLAASI: SS 2

ISIOKWU: NKEBIOKWU

NDINISIOKWU:

  • IHE BU NKEBIOKWU
  • NKBIOKWU DI ICHE ICHE NA OMUMAATU HA N’IME AHIRIOKWU

IHE BU NKEBIOKWU

Nkebiokwu bu usorookwu nwere nghota ma  o nweghi ngwaa.

Nghota nkebiokwu anaghi ezucha oke iziputa echiche nke oma.

Njirimara nkebiokwu:

1.Nkebiokwu ga-aburiri mkpuruokwu abuo maobu karia

2.O ga-aburiri aha maobu  nnochiaha na mkpuruokwu ndi ozo.                  

  1. Ha na-anokari n’isiahiri
  2. O naghi enwe ngwaa.

 omumaatu:

  1. Ndi mmadu
  2. Ha ncha

3.Anyi onwe anyi.

 NNWALE

1.Kowaa ihe bu nkebiokwu

2.Were ahiriokwu ato deputa nkebiokwu

  1. 2.  NKEBIOKWU DI ICHE ICHE NA OMUMAATU HA N’IME AHIRIOKWU

1.Nkebiokwu keaha: O bu nkebiokwu e si n’aha maobu nnochiaha enwete.

Dika:

  1. {l]Oka anyi buru ibu.
  2. Osisi ]j na-esi ike
  3. Chinasa nwere anya nwaologbo
  4. Nkebiokwu kenkowa: Nke a bu aha nke nkowa na-esote.

Dika: a. Ezigbo nwaanyi. (b) Nwoke ojoo (ch)Girigi nwaanyi.(d) Ulo ohuru (e) Ogologo ukwu (f)Ajo mmadu.

 

  1. Nkebiokwu kenruaka: O bu aha nke nruaka na-esote.

Dika:

  1. Iko a mara mma
  2. Nwanyi ahu buru ibu
  3. Nkebiokwu kembuuzo: Nke a na-abu mbuuzo nke aha na-eso.

  Dika:

  1. Agu bi n’ohia                           
  2. Atuzila okwute na gbamgbam
  3. Nkebiokwu kemfinitivi: O bu mfinitivi nke aha na-esote.

Dika:

a.Itu asi na-ebute iga oku mmuo

  1. Anyi akwusila ife arusi
  2. Nkebiokwu kenkwuwa: O bu usoro okwu na-etinyekwu nghota na ngwaa.

Dika:

  1. Kwa mgbede ka o na-abia
  2. Uche na-aga ije nwayo nwayo.

   NNWALE

  1. Gini bu nkebiokwu keaha?
  2. Dee omumaatu nkebiokwu kenkwuwa. Ato].

NCHIKOTA  NNWALE:

  1. Nke bu nkebiokwu bu…
  2. usoro okwu nwere nghota enweghi ngwaa

B.Okwu nwere ngwaa e nweghi nghota

  1. Okwu a horo nke oma
  2. Olu okwu be ndi

2…..bu omumaatu nkebiokwu keaha

A.Nne m mara mma

  1. ulouka anyi
  2. Bia ebe a
  3. Gaa olu
  4. Otu n’ime ndi a adighi na nkebiokwu
SEE ALSO  SS1 Second Term Government Lesson Note – Structure and Organization of Government: Executive

A.Nkowaaha B.Nnochiaha C.Ngwaa D.Njiko

4.Kedu nke bu njirimara nkebiokwu?

  1. O nwere nghota B.O nweghi nghota C. O na-enwe ngwaa D. O ga-enweriri nkwuwa
  2. Hoputa nke bu nkebiokwu kenkwuwa
  3. Oku oku B.riri ji C. mara mma D. ruru oru

EDEMEDE NNWALE:

1.Gini bu nkebiokwu?

  1. Deputa udi nkebiokwu di iche iche e nwere

3.Kowaa nkebiokwu mbuuzo ma nye otu omumaatu

  1. Dee omumaatu nkebiokwu ato
  2. Mee ahiriokwu ato nwere nkebiokwu ma kaa okwu nkebiokwu ihe n’okpuru.

ORU NGWUCHA IZUUKA:

Guo akwukwo ‘Nchikota  ihe omumu asusu Igbo maka ule sinio sekondiri’ nke maazi M.C. Ngoesi dere Onye mbiputa ya bu OPTIMAL PRESS.Ihu akwukwo nke iri itoolu na otu.

IHE OGUGU MAKA NKWADO  IZUUKA OZO

Guo akwukwo ‘Oja dufuo dike’ma kowaa isi ihe o na-ekw[ maka ya.

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA

Were nkebiokwu mee ahiriokwu iri di iche iche .

AKWUKWO  NLERE ANYA:

  1. Nchikta ihe omumu uda asusu Igbo maka ule sinio sekondiri’ nke maazi M.C. Ngoesi dere Onye mbiputa ya bu OPTIMAL PRESS.
  2. Exam Focus nke N]lue Emenanj] dere. Onye mbip[ta b[ University press.

 

DOWNLOAD Complete note for SS1 FIRST TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS1 SECOND TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS1 THIRD TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS2 FIRST TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS2 SECOND TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS2 THIRD TERM >> LINK

DOWNLOAD Complete note for SS3 FIRST TERM >> LINK

Copyright warnings! Do not copy.